Daniel 5:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Belshaza, bú eze, mere oké oriri nye nnù ndi-isi-ya abua na ọgu iri, ọ bu kwa n'iru nnù abua na ọgu iri ahu ka ọ nāṅu manya-vine.

2. Belshaza, mb͕e ọ nēdetu manya-vine ahu ire, ọ siri ka achita iko ọla-edo na ọla-ọcha nke Nebukadneza, bú nna-ya, chiputarari n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem; ka eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-enyi-ya nwanyi we ṅua manya-vine nime ha.

3. Mb͕e ahu ha chitara iko ọla-edo nke achiputarari n'ulo uku nke ulo Chineke nke di na Jerusalem; eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-iko-ya nwan yi we ṅua manya-vine nime ha.

4. Ha ṅuru manya-vine, we ja chi nile nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume.

Daniel 5