Daniel 4:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Nebukadneza, bú eze, nēzigara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ozi, bú ndi bi n'uwa nka nile; ka udo bara unu uba.

2. Ihe-iriba-ama nile na ihe-iju-anya nile nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu meworo n'imesom, ọ dim nma n'anya ikọ akukọ ha.

3. Ihe-iriba-ama-Ya nile, le ka ha si di uku ri nne! ihe-iju-anya-Ya nile kwa, le ka ha si di ike nke-uku! ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile.

4. Mu onwem, bú Nebukadneza, nọ n'udo n'ulom, nọ kwa ka osisi nwezuru akwukwọ ndu ya n'ulo ukum.

5. Nrọ ka m'huru, o we me ka m'tua egwu; èchìchè nile m'nēchè n'elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m'ma jijiji.

6. N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon bata n'irum, ka ha we me ka m'mara isi nrọ ahu.

7. Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n'iru ha; ma ha emeghi ka m'mara isi-ya.

8. Ma n'ikpe-azu Daniel batara n'irum, onye aha-ya bu Belteshaza, dika aha chim si di, onye mọ nke chi nsọ nile di kwa nime ya: ọ bu kwa n'iru ya ka m'zere nrọ ahu, si,

9. Belteshaza, onye-isi ndi-ode-akwukwọ di nsọ, n'ihi na mu onwem mara na mọ nke chi nsọ nile di nime gi, na ọ dighi ihe-nzuzo ọ bula nēsob͕u gi, kọrọm ọhù nile nke nrọm nke m'huworo, na isi-ya.

Daniel 4