5. Na mb͕e ahu mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala, kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ:
6. ma onye ọ bula nke nāgaghi-ada n'ala kpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu.
7. N'ihi nka, n'otù mb͕e ahu, mb͕e ndi nile di iche nuru olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke ubọ na opì nile di iche iche, ha we nāda n'ala, bú ndi nile di iche iche, na mba nile di iche iche, na ndi nile nāsu asusu di iche iche, ha we nākpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ.
8. N'ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n'otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo.
9. Ha zara, si Nebukadneza, bú eze, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi.
10. Gi onwe-gi, eze, enyewo iwu, si, na onye ọ bula nke gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu:
11. ma onye ọ bula nke nādaghi n'ala kpọ isi ala, agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu.
12. Ndi-Ju ufọdu di ndi i doworo ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon, ha bu Shedrak na Mishak na Abed-nego; ndikom ndia anughi olu-gi, eze: chi-gi nile ka ha nādighi-efè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo nke i guzobeworo ọtọ ka ha nādighi-akpọ isi ala nye.
13. Mb͕e ahu Nebukadneza n'oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n'iru eze.
14. Nebukadneza zara, si ha, Ọ̀ bu ihe unu zubeworo, unu Shedrak, na Mishak, na Abed-nego, na chim ka unu nādighi-efè, ọ̀ bu kwa onyinyo ọla-edo nke m'guzobeworo ọtọ ka unu nādighi-akpọ isi ala nye?
15. Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?
16. Shedrak na Mishak na Abed-nego zara, si eze, Nebukadneza, ọ dighi ayi onwe-ayi nkpà izaghachi gi okwu bayere nka.