29. gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n'uche-gi n'elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi.
30. Ma mu onwem, ọ bughi n'ihi amam-ihe ọ bula nke di nimem kari n'ihe ọ bula di ndu ka ekpugheworo ihe-nzuzo a nyem, kama ọ bu ka ewe me ka eze mara isi-ya, ọ bu kwa ka i we mara èchìchè nke obi-gi.
31. Gi onwe-gi, eze, nọ nāhu, ma le, otù onyinyo madu nke di uku. Onyinyo a, nke riri nne, nke ib͕u-maramara-ya kachasi ihe nile, nēguzo n'iru gi; ọ di egwu n'ile ya anya.
32. Onyinyo ahu, isi-ya bu ezi ọla-edo, obi-ya na ogwe-aka-ya abua bu ọla-ọcha, afọ-ya na apata-ukwu-ya abua bu ọla,
33. ogwe-ukwu-ya abua bu ígwè, ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè ma ufọdu nime ha bu urọ.
34. I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n'ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha.
35. Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.
36. Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze.
37. Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;