Daniel 2:15-19 Bible Nso (IGBOB)

15. ọ zara, si Ariok, bú onye nke eze nke nwere ike n'aru madu, N'ihi gini ka iwu a di ọku ọku site n'iru eze? Mb͕e ahu ihe Ariok mere ka Daniel mara okwu a.

16. Daniel we bata, kpere eze ka o nye ya mb͕e akara àkà, ka o we kọrọ eze isi nrọ ahu.

17. Mb͕e ahu Daniel lara n'ulo-ya, me ka Hananaia na Mishael na Azaraia, bú ndi-ibe-ya, mara okwu ahu:

18. ka ha we riọ obi-ebere nile n'aka Chineke nke elu-igwe bayere ihe-nzuzo ahu; ka Daniel na ndi-ibe-ya we ghara isoro ndi-amam-ihe Babilon fọduru la n'iyì.

19. Mb͕e ahu Daniel ka ekpughere ihe-nzuzo ahu nye n'ọhù nke abali. Mb͕e ahu Daniel gọziri Chineke nke elu-igwe.

Daniel 2