Daniel 11:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Ma n'ọgwugwu arọ ufọdu ha gēkekọta onwe-ha; ada eze nke Ndida gābiakute kwa eze Ugwu idozi okwu n'uzọ ziri ezi: ma nwanyi ahu agaghi-anagide ike nke ogwe-aka-ya; nwoke ahu agaghi-eguzogide kwa, ya na ogwe-aka-ya; ma agārara nwanyi ahu nye, ya onwe-ya, na ndi nēme ka ọ bia, na nna muru ya, na nwoke nke nēme ka ọ di ike na mb͕e ahu nile.

7. Ma otù onye gēsi n'ome nke nkpọrọgwu nwan yi ahu nile guzo ọtọ n'ọnọdu nwoke ahu, biakute usu-ndi-agha-ya, bata n'ebe siri ike nke eze Ugwu, megide ha, ghọ onye di ike:

8. ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu.

9. Ọ gābata kwa n'ala-eze nke eze Ndida, ma ọ gālaghachi n'ala nke aka ya.

10. Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.

11. Ma eze Ndida gēwe iwe di ilu, puta, buso ya agha, bú eze Ugwu ahu: ọ gēguzo kwa oké ìgwè madu, ma agēnye ìgwè madu ahu n'aká-ya.

Daniel 11