Daniel 11:20-24 Bible Nso (IGBOB)

20. Ma otù onye nke nēme ka onye nke nāchi n'ihe-ike gabiga n'ima-nma ala-eze ahu gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya: ma n'ubọchi ole-na-ole ka agētipia ya, ma ọ bughi n'iwe, ọ bughi kwa n'agha.

21. Ma otù onye eledara anya gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya, onye ha nātukwasighi ebube nke ala-eze: ma ọ gābata nime na mb͕e udo, were ire-utọ nile nata ala-eze ahu.

22. Ma ogwe-aka nile nke nrubiga-ókè ahu ka agēji ruchapu ha n'iru ya, tipia ha; e, onye-ndú nke ọb͕ub͕a-ndu kwa.

23. Ma site na mb͕e madu kekọtara onwe-ha n'ebe ọ nọ ọ gālu ọlu aghughọ: ọ gēji kwa otù mba di nta rigo n'elu, nwe ume.

24. Na mb͕e udo na imegide ebe nile di urù nke ala anāchi achi ka ọ gābia; ọ gēme kwa ihe nke nna-ya-hà na ndi bu nna nna-ya-hà nēmeghi; ihe-nluta-n'agha na ihe-nkwata na àkù ka ọ gēkesara ha: ọ bu kwa imegide ebe di iche iche ewusiri ike ka ọ gēchè èchìchè-ya nile, ọbuná rue mb͕e akara àkà.

Daniel 11