Daniel 10:4-15 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa mbu, mb͕e mu onwem nọ n'akuku osimiri uku ahu, ya bu Hidekel,

5. m'we welie anyam abua, hu, ma, le, otù onye yiri uwe ọcha, onye ekere ihe-ọkiké ọla-edo ọma nke Ufaz n'úkwù-ya:

6. aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n'ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu.

7. Mu onwem, bú Daniel, náním, huru ọhù ahu: ma ndikom ahu ndi mu na ha nọ ahughi ọhù ahu; ma otù ọ di, oké ọma-jijiji dakwasiri ha, ha we b͕alaga izobe onwe-ha.

8. Mu onwem we fọduru náním, m'we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n'ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n'arum, m'we ghara inagide ike ọ bula.

9. M'we nu olu okwu-ya nile: ma mb͕e m'nuru olu okwu-ya nile mu onwem adawori n'oké ura kpue irum n'ala, irum we che n'ala.

10. Ma, le, otù aka meturum, me ka m'guzo nāṅaghari n'elu ikperèm abua na ọbu-akam abua.

11. O we sim, Daniel, onye bu ihe anāchọsi ike nke-uku, ghọta okwu nile nke mu onwem nāgwa gi, gi guzo kwa ọtọ n'ebe-nguzo-gi; n'ihi na ub͕u a ka ezìworom biakute gi: mb͕e ọ kpayerem uka nka, m'we guzo ọtọ nāma jijiji.

12. O we sim, Atula egwu, Daniel; n'ihi na site n'ubọchi mbu ahu mb͕e i nyere obi-gi ighọta ihe na iweda onwe-gi n'ala n'iru Chineke-gi, anuru okwu-gi nile: mu onwem abiawo kwa n'ihi okwu-gi nile.

13. Ma onye-isi ala-eze Peasia nēguzo na ncherita-irum orú ubọchi na otù; ma, le, Maikael, bú otù nime ndi-isi ndi bu isi, biara iyerem aka: mu onwem we fọdu n'ebe ahu n'akuku ndi-eze Peasia.

14. Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.

15. Mb͕e ọ kpayerem uka dika okwu ndia si di, m'we che irum n'ala, da ob͕i.

Daniel 10