Daniel 1:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Jehoiakim, bú eze Juda, ka Nebukadneza, bú eze Babilon, biara na Jerusalem, nọchigide ya n'agha.

2. Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya.

3. Eze ahu we si Ashpenaz, bú onye-isi ndi-onozi-ya, ka o me ka ufọdu n'umu Israel bata, bú ufọdu nime nkpuru ala-eze na nime ndi-isi;

Daniel 1