Aisaia 8:3-16 Bible Nso (IGBOB)

3. M'we bakuru nwunyem, bú amuma-nwanyi; o we turu ime, mua nwa-nwoke. Jehova we sim, Kpọ aha-ya Maha-shalal-hash-baz.

4. N'ihi na tutu nwata ahu amara ikpọ, si, Nnam, na, Nnem, agēbulaga àkù Damaskọs na ihe Sameria akwatara n'agha n'iru eze Asiria.

5. Jehova we gwakwam okwu ọzọ, si,

6. N'ihi na ndi nka ajuwo miri Shailoa nke nāga nwayọ, ma obi-utọ-ha di n'ebe Rezin na nwa Remalaia nọ;

7. ọbuná n'ihi nka, le, Onye-nwe-ayi nēme ka miri Osimiri rigokwasi ha, bú miri nke di ike di kwa ọtutu, ọbuná eze Asiria na ebube-ya nile: ọ gārigokwasi kwa ebe-ya nile miri si erù, rusa usọ-ya nile:

8. ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.

9. Jọnu njọ, unu ndi di iche iche, ma agētipia unu; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile nọ n'ebe di anya nke uwa: kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu; kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu.

10. Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi.

11. N'ihi na otú a ka Jehova sirim n'ike nke aka-Ya, O we dọm aka na nti ka m'ghara ije ije n'uzọ ndi nka, si,

12. Unu agaghi-asi, Nkekọta imegide eze, n'ihe nile nke ndi nka nāsi, Ọ bu nkekọta imegide eze; unu agaghi-atu kwa egwu ihe ha nātu egwu ya, unu agaghi-ama-kwa-ra ya jijiji.

13. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya ka unu gēdo nsọ; Ya onwe-ya buru kwa ihe unu nātu egwu, Ya onwe-ya buru kwa ihe nēme ka unu ma jijiji.

14. Ọ gāghọ kwa ebe nsọ; ma Ọ gāghọrọ ulo abua nke Israel nkume ikpọbì-ukwu na oké nkume isu-ngọngọ, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem ib͕udu na ọnyà.

15. Ọtutu nime ha gāsu kwa ngọngọ, we da, ewe tipia ha, ha gāma kwa n'ọnyà, ewe nwude ha.

16. Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n'etiti ndi-nmutam.

Aisaia 8