1. Jehova we sim, Were n'onwe-gi otù oké mbadamba ihe, ji kwa ihe madu ji ede ihe-odide dekwasi ya, Nka diri Maha-shalal-hash-baz;
2. M'gēme kwa ka ndi-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi nọrọm n'àmà, bú Uraia onye-nchu-àjà, na Zekaraia nwa Jeberekaia.
3. M'we bakuru nwunyem, bú amuma-nwanyi; o we turu ime, mua nwa-nwoke. Jehova we sim, Kpọ aha-ya Maha-shalal-hash-baz.