7. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa.
8. N'ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi:
9. ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.
10. Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si,
11. Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu.
12. Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova.
13. O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem?
14. N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.