5. N'ihi na Siria aduwo ọdu imegide gi ihe ọjọ, Efraim kwa, na nwa Remalaia, si,
6. Ka ayi rigo imegide Juda, ka ayi me kwa ka ike gwusia ya, ka ayi wapuere onwe-ayi ya, me ka otù onye buru eze n'etiti ya, bú nwa Tabeel.
7. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa.
8. N'ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi:
9. ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.
10. Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si,
11. Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu.
12. Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova.
13. O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem?