23. O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke.
24. Agāchiri àkú, were kwa uta, bia n'ebe ahu; n'ihi na nání ogwu na uke ka ala nka nile gābu.
25. Ma ugwu nile nke anējiri ọ́gù bọ, i gaghi-abà n'ebe ahu n'ihi egwu ogwu na uke, kama ọ gābu ebe anēziga ehi, na ebe aturu nāzọ ukwu.