Aisaia 7:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'ubọchi Ehaz nwa Jotam, nwa Uzaia, bú eze Juda, na Rezin, bú eze Siria, rigoro, ya na Peka nwa Remalaia, bú eze Israel, rue Jerusalem, ibu agha megide ya; ma ọ pughi ibu agha megide ya.

2. Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe.

3. Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà;

Aisaia 7