Aisaia 66:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Ònye nuworo ihe dika nka? ònye huworo ihe dika ndia? Ìme ala gēme ya n'otù ubọchi? àgāmu mba n'otù mb͕e? n'ihi na ime mere Zaion, ọ mu-kwa-ra umu-ya.

9. Mù onwem gēme ka nwa rue ọmumu, ghara ime ka amua ya? ka Jehova siri: ma-ọbu Mu onwem nke nēme ka amua, M'gēmechi àkpà-nwa? ka Chineke-gi siri.

10. Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n'ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n'anya: ka obi tọ unu utọ n'ebe ọ nọ site n'obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya:

11. ka unu we ṅujue ara nkasi-obi-ya nile afọ; ka unu we miputa ara, njubiga-ókè nke nsọpuru-ya ewe tọ unu utọ.

12. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Le, M'nēsetiru ya udo dika osimiri, na nsọpuru nke mba di iche iche dika iyi nke nērubiga ókè, unu gāmiputa nime ha; n'akuku ka agēkuru unu, ọ bu kwa n'ikperè ka agātughari unu.

13. Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi.

14. Unu gāhu kwa ya, o we tọ obi-unu utọ, ọkpukpu nile unu gējuputa na ndu dika ahihia ndu: agāma kwa aka Jehova n'ebe ndi-orù-Ya nọ, Ọ gēwesa kwa ndi-iro-Ya iwe.

15. N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.

16. N'ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba.

Aisaia 66