Aisaia 64:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri;

2. dika mb͕e ọku nāb͕a umu osisi, dika mb͕e ọku nēme ka miri b͕ọ: ime ka ndi nēmegide Gi mara aha-Gi, ka mba di iche iche we si n'iru Gi ma jijiji.

3. Mb͕e I mere ihe di egwu nke ayi nēleghi anya ha, I ridatara, ugwu nile siri n'iru-Gi rùda dika miri.

4. Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga madu anughi, ha anutaghi kwa na nti, anya ahughi kwa otù Chineke, ma ewezuga nání Gi, Nke nāluru onye nēchere Ya ọlu.

5. I zutewo onye nēwere obi-utọ alu ezi omume, bú ndi nēcheta Gi n'uzọ-Gi nile: le, Gi onwe-gi were iwe, ayi we mehie: nime ha ka ayi nọworo mb͕e ebighi-ebi, àgāzọputa kwa ayi?

6. Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe.

7. Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi.

8. Ma ab͕ua a, Jehova, Nna-ayi ka I bu: ayi onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu ayi; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu.

9. Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.

Aisaia 64