12. N'ihi na njehie-ayi bara uba n'iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n'ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n'otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha:
13. njehie, na igọnari Jehova, na isi n'iso Chineke-ayi laghachi azu, na ikwu okwu nmeb͕u na nwezuga, na ime okwu-ugha nile site n'obi-ayi, na ikwuputa ha.
14. Emewo kwa ka ikpe ziri ezi laghachi azu, ezi omume nēguzo kwa n'ebe di anya: n'ihi na ezi-okwu asuwo ngọngọ n'amá, izi-ezi apughi kwa ibata.
15. E, ezi-okwu aghọwo ihe anāhughi; ọzọ, onye nēsi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya nēme onwe-ya ihe-nkwata: Jehova we hu ya, ọ jọ njọ n'anya-Ya na ikpé ziri ezi adighi.