1. Otú a ka Jehova siri, Debenu ikpé ziri ezi, me-kwa-nu ezi omume: n'ihi na nzọputam di nso ibia, ezi omumem di kwa nso ka ekpughe ya.
2. Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye nēme nka na nwa madu nke nējidesi ya ike bu; onye nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nēdebe kwa aka-ya ghara ime ihe ọjọ ọ bula.
3. Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu.