Aisaia 55:4-11 Bible Nso (IGBOB)

4. Le, enyewom ya ka ọ buru onye-àmà nye ndi nile di iche iche, ka ọ buru onye-ndú na onye-iwu nye ndi nile di iche iche.

5. Le, mba nke i nāmaghi ka i gākpọ, mba nke nāmaghi gi gāb͕akute kwa gi, n'ihi Jehova, bú Chineke-gi, ọbuná n'ihi Onye Nsọ nke Israel; n'ihi na O mewo ka i ma nma.

6. Chọnu Jehova mb͕e anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mb͕e Ọ nọ nso:

7. onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba.

8. N'ihi na èchìchè nkem, ha abughi èchìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abughi uzọm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

9. N'ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa, otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka èchìchèm nile di elu kari èchìchè nile unu.

10. N'ihi na dika oké miri-ozuzọ na snow si esi n'elu-igwe ezo, ma ọ bughi n'ebe ahu ka ọ nālaghachi, ma ọ buru na o bughi uzọ desia ala, we me ka o me ihe-omume, ka o pu kwa ihe-opupú; o we were nkpuru nye ọgha-nkpuru, were kwa nri nye onye nēri ihe;

11. otú a ka okwum di nke nēsi n'ọnum puta: ọ gaghi-alaghachikutem n'efu, ma ọ buru na o bughi uzọ mezu ihe tọrọm utọ, we ga nke-ọma n'ihe M'zigara ya.

Aisaia 55