1. Teta, teta, yiri ike-gi dika uwe, gi Zaion; yiri uwe-gi nile mara nma, gi Jerusalem, bú obodo nsọ: n'ihi na onye nēbighi úgwù na onye ruru árú agaghi-abata kwa nime gi ọzọ site n'ub͕u a.
2. Rurupu onwe-gi, si n'ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n'olu-gi, gi ada Zaion adọtara n'agha.
3. N'ihi na otú a ka Jehova siri, N'efu ka erere unu; ọ bughi kwa ego ka agēji b͕aputa unu.
4. N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ bu Ijipt ka ndim ridaruru na mbu inọ n'ebe ahu dika ọbìa: Asiria kwa, n'efu ka ọ meb͕uru ha.