10. N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.
11. Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.
12. Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.
13. N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.
14. N'ihi nka ala-mọ emewo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara, ọ saghebigawo kwa ọnu-ya ókè: ima-nma Jerusalem, na ìgwè-ya, na nkpọtu-ya, na onye nāṅuri ọṅu-agha n'etiti ya, gārida kwa nime ya.
15. Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala:
16. ma Jehova nke usu nile nke ndi-agha di elu n'ikpé, edowo kwa Chineke, bú Onye Nsọ ahu, nsọ n'ezi omume.
17. Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n'ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba.
18. Ahuhu gādiri ndi chiri udọ̀ ihe-efu adọkpu ajọ omume, ndi ji kwa dika agāsi na ọ bu udọ̀ ub͕ọ-ala adọkpu nmehie:
19. ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara.
20. Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētiye ọchichiri n'ọnọdu ìhè, na ìhè n'ọnọdu ọchichiri; ndi nētiye ihe ilu n'ọnọdu ihe utọ, na ihe utọ n'ọnọdu ihe ilu!
21. Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!