Aisaia 47:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.

2. Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.

3. Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu.

4. Onye-nb͕aputa-ayi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya, bú Onye Nsọ nke Israel.

5. Nọdu du, ba n'ọchichiri, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gāghi-abu onye ha nākpọ, Nwanyi-nwe ala-eze di iche iche.

6. Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.

7. I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.

8. Ma ub͕u a nuru nka, gi nwanyi nēme ka o si tọ gi utọ, gi onye nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem; m'gaghi-anọ dika nwanyi di-ya nwuru, m'gaghi-ama kwa ọb͕ub͕a-aka-umu:

9. ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.

10. I we tukwasi obi n'ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem.

11. Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.

Aisaia 47