Aisaia 45:18-21 Bible Nso (IGBOB)

18. N'ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n'efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.

19. Ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu, n'otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n'ebe tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem bu Jehova, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi.

20. Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.

21. Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.

Aisaia 45