Aisaia 44:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọ gābu-kwa-ra madu ihe isure ọku; o we were ufọdu nime ha, nya ọku; e, ọ funwue ya, we sie achicha: e, ọ nāpi chi, we kpọ isi ala nye ya; o mewo ya arusi apiri api, we da kpue iru n'ala n'iru ya.

16. Nkera-ya ka o sureworo n'ọku; o ji nkera-ya eri anu; ọ nāru anu-ọruru, we rijue afọ: e, ọ nānya ọku we si, Ehe, aru ekpowom ọku, ahuwom ọku:

17. ma nke fọduru nime ya ka o meworo ka ọ ghọ chi, ọbuná arusi ya-akiri-api: ọ nāda kpu iru n'ala n'iru ya, nākpọ kwa isi ala, nēkpere ya, si Naputam; n'ihi na chim ka i bu.

18. Ha amaghi, ha adighi-aghọta kwa: n'ihi na O techiwo anya-ha, ha we ghara ihu uzọ; O techiwo obi-ha, ha we ghara inwe uche.

19. Ọ dighi kwa onye nēchetara obi-ya, ọ dighi kwa ihe-ọmuma maọbu nghọta di isi, Nkera-ya ka m'sureworo n'ọku; ọzọ kwa, esiwom achicha n'elu icheku-ọku-ya nēre ere; anamaru anu rie: #m'gēme kwa nke fọduru nime ya ka ọ ghọ ihe-árú? ọ̀ bu n'iru ogwe osisi ka m'gāda kpue iru n'ala?

20. Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim?

21. Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi.

Aisaia 44