Aisaia 44:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ub͕u a, nuru, Jekob, bú orùm; nuru kwa, Israel, nke M'rọputara:

2. Otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Onye kpuwo-kwa-ra gi site n'afọ nne-gi, Nke nēyere gi aka; Atula egwu, gi orùm, bú Jekob; na gi, Jeshurum, nke M'rọputara.

3. N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:

4. ha ewe pue n'etiti ahihia, dika osisi willow n'akuku iyi juputara na miri.

5. Otù onye gāsi, Onye Jehova nwere ka m'bu; onye ọzọ gākpọ onwe-ya n'aha Jekob; onye ọzọ gēdekwasi n'aka-ya, Onye Jehova nwere, ọ gēji kwa aha Israel tue onwe-ya aha.

6. Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.

7. Ọ̀ bu kwa onye, dika Mu onwem, nākpọ, nēgosi ya, nēdorom ya n'usoro, site na mb͕e M'doro ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga? ihe nile nke gādi n'iru, na nke gābia, ka ha gosi ha.

8. Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara.

9. Ndi n-akpu arusi apiri api, ha nile bu ihe tọb͕ọrọ n'efu; ihe nile anāchọsi nke ha agaghi-aba urù: ndi-àmà-ha kwa, ha onwe-ha adighi-ahu uzọ, ha adighi-ama kwa; ka ihere we me ha.

10. Ònye kpuworo chi, ma-ọbu wua arusi apiri api nke nābaghi urù ma-ọli?

11. Le, ihere gēme ndi ejikọtara ya na ha; ndi-ọ̀kà kwa, ha onwe-ha bu ihe zara madu: ka ha chikọta onwe-ha, ha nile, ka ha ọtọ; ha gātu oké egwu, ihere gēme ha n'otù.

12. Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà.

Aisaia 44