Aisaia 43:20-28 Bible Nso (IGBOB)

20. Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara:

21. ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.

22. Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.

23. I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi.

24. I jighi ego zutaram uda calamus, i jighi kwa abuba nke àjà-gi nile me ka afọ jubigam ókè: kama i jiwo nmehie-gi nile me ka M'fè òfùfè, i jiwo ajọ omume-gi nile me ka ike gwum.

25. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.

26. Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume.

27. Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem.

28. M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.

Aisaia 43