12. Mu onwem egosiwo, zọputa kwa, me kwa ka anuru, ọ dighi kwa chi ala ọzọ di n'etiti unu: unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm, Ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Mu onwem bu kwa Chineke.
13. Ọzọ, site n'ubọchi ta Mu onwem bu Ya; ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam: anamalu ọlu, ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu?
14. Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.
15. Mu onwem bu Jehova, Onye Nsọ unu, na Onye kèworo Israel, na Eze-unu.
16. Otú a ka Jehova siri, bú Onye ahu Nke nākwa uzọ n'oké osimiri na okporo-uzọ nime miri di ike;
17. Nke nēme ka ub͕ọ-ala na inyinya na usu-ndi-agha na dìnkpà puta; n'otù ka ha nēdinakọta, ha agaghi-ebili; ha anyu a, dika ogho-oriọna ka emenyuworo ha emenyu:
18. Unu echetala ihe mbu nile, unu atughari-kwa-la ihe nile nke mb͕e ochie n'obi.
19. Le, anameme ihe ọhu; ub͕u a ka ọ gēpú; ùnu agaghi-ama ya? e, M'gēme ka uzọ di n'ọzara, me kwa ka osimiri di iche iche di n'ala tọb͕ọrọ n'efu.
20. Anu ọhia gāsọpurum, bú nkita-ọhia na enyi-nnunu: n'ihi na enyewom miri n'ọzara na osimiri di iche iche n'ala tọb͕ọrọ n'efu, ime ka ndim ṅua, bú ndi M'rọputara:
21. ndi M'kpuworo nye Onwem, akukọ otutom ka ha gākọ.
22. Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.
23. I kpughi aturu nke àjà-nsure-ọku-gi nile biakutem; i jighi kwa àjà-gi nile sọpurum. Ejighm onyinye-inata-iru-ọma me ka i fè òfùfè, ejighkwam frankincense me ka ike gwu gi.
24. I jighi ego zutaram uda calamus, i jighi kwa abuba nke àjà-gi nile me ka afọ jubigam ókè: kama i jiwo nmehie-gi nile me ka M'fè òfùfè, i jiwo ajọ omume-gi nile me ka ike gwum.
25. Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.
26. Chetaram; ka ayi kpekọ ikpe: gi onwe-gi kọ akukọ-gi, ka ewe gua gi n'onye ezi omume.
27. Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem.
28. M'gēme kwa ndi-isi di nsọ ka ha ghara idi nsọ, nye kwa Jekob ka ọ buru ihe ewezugara ka ebibie ya, nye kwa Israel ka ọ buru ihe-nkwulu.