18. Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ?
19. Arusì apiri api, onye-ọ̀kà b͕azere ya, onye-nnucha-ọla nāmachita ya ọla-edo, ọ bu kwa iyab͕a ọla-ọcha ka ọ nākpuru ya.
20. Onye dara ob͕eye kari ichu àjà-nbuli di otú a nārọputa osisi nke nādighi-ere ure; onye-ọ̀kà nke mara ihe ka ọ nāchọputara onwe-ya idozi arusi apiri api nke anāgaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya.
21. Ùnu amaghi? ùnu anughi? ègosighi unu ya site na mb͕e mbu? ùnu aghọtaghi site na ntọ-ala nile nke uwa?
22. Ọ bu Onye ahu Nke nānọdu n'elu buruburu uwa, ndi bi nime ya ewe di ka ogugu; Nke nēseti elu-igwe dika ákwà di nfe, we b͕asa ha dika ulo-ikwū ibi ebi:
23. Nke nēme ndi-isi ka ha ghọ ihe-efu; Ọ mewo ndi-ikpe uwa ka ha di ka ebe tọb͕ọrọ n'efu.
24. E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n'ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku.
25. Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M'we ra ka ya? ka Onye Nsọ nāsi.
26. Welienu anya-unu elu, hu: ọ̀ bu Onye kère ihe ndia? ọ bu Onye ahu Nke nēme ka usu-ha puta n'ọnu-ọgugu: ha nile n'aha-ha ka Ọ nākpọ; site n'iba-uba nke ike-Ya, na n'ihi na O nwere ume n'ike, ọ dighi ihe fọduru nke anāgughi.
27. N'ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n'ebe Chinekem nọ gabiga?
28. Ì maghi? ì nughi? Chineke nke mb͕e ebighi-ebi ka Jehova, Onye kèworo nsọtu nile nke uwa, bu; Ọ dighi-ada #mbà, ike adighi-agwu kwa Ya; ọ dighi ngwuputa anēgwuputa nghọta-Ya.
29. Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.
30. Ọbuná umu-ckoro nāda #mbà, ike nāgwu kwa ha, ọbuná umu-okorọbia nāsu ngọngọ da:
31. ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.