15. Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe.
16. Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku.
17. Mba nile di ka ihe-efu n'iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka aguworo ha nye Ya.
18. Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ?