Aisaia 4:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n'akwukwọ idi ndu nime Jerusalem:

4. mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.

5. Jehova gēkè kwa n'elu ebe ahu nile guzosiri ike nke ugwu Zaion, na n'elu nkpọkọta-ya nile, igwe-oji na anwuru-ọku n'ehihie, na onwunwu nke ọku nēre ere n'abali: n'ihi na n'elu ebube nile ka agāb͕asa ihe-nkpuchi.

6. Ulo-ntu gādi kwa ibu ǹdò n'ehihie ipu n'okpom-ọku, na ibu ebe-nb͕abà, na ibu ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo na ipu na miri-ozuzo nile.

Aisaia 4