6. Aisaia we si ha, Otú a ka unu gāsi onye-nwe-unu, Otú a ka Jehova siri, Atula egwu n'ihi okwu nile nke i nuworo, nke ndi nējere eze Asiria ozi jiri kwulum.
7. Le, M'nētiye otù mọ nime ya, ọ gānu kwa akukọ, laghachi n'ala-ya; m'gēme kwa ka ọ da site na mma-agha n'ala-ya.
8. Rabshake we laghachi, huta eze Asiria ka ọ nēbuso Libna agha: n'ihi na O nuru na o siwo na Lekish bulie ije.
9. Ọ we nu ihe bayere Tiahaka, bú eze Etiopia, si, Ọ putawo ibuso gi agha. O we nu, zìe ndi-ozi jekuru Hezekaia, si,
10. Otú a ka unu gāgwa Hezekaia bú eze Juda, okwu, si, Ekwela ka Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nātukwasi obi, rafue gi, si, Agaghi-enye Jerusalem n'aka eze Asiria.
11. Le, gi onwe-gi anuwo ihe ndi-eze Asiria meworo ala nile, n'iwezuga ha ka ebibie ha: àgānaputa kwa gi onwe-gi?
12. chi nile nke mba nile ọzọ, hà anaputawo ha, bú ndi nnam-hà bibiworo, Gozan, na Haran, na Rezef, na umu Eden, ndi nọ na Telasa?
13. Òle ebe eze Hemat di, na eze Apad, na eze obodo Sefavaim na Hina na Iva?
14. Hezekaia we nata akwukwọ n'aka ndi-ozi ahu, gua ya: Hezekaia we rigorue ulo Jehova, b͕asa ya n'iru Jehova.
15. Hezekaia we kpe ekpere n'iru Jehova, si,
16. Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, Onye nēbi n'etiti cherubim, Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi, nke ala-eze nile nke uwa; Gi onwe-gi mere elu-igwe na uwa.
17. Jehova, tọ nti-Gi n'ala, nu; Jehova, saghe anya-Gi abua, hu: nu kwa okwu nile nke Senakerib, nke zitere madu ita Chineke di ndu uta.
18. N'ezi-okwu, Jehova, ndi-eze Asiria emewo ka ala nile na ala-ha tọb͕ọrọ n'efu,
19. ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.
20. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke-ayi, zọputa ayi n'aka-ya, ka ala-eze nile nke uwa we mara na Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi.
21. Aisaia nwa Emoz we zigara Hezekaia ozi, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ekpere nke i kpeworom bayere Senakerib, bú eze Asiria, anuwom ya.
22. Nka bu okwu nke Jehova kwuworo bayere ya: Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Zaion elelìwo gi anya, chìnye gi ihere n'iru; ada Jerusalem efufewo isi n'azu gi.
23. Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.
24. I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.