8. Ma ub͕u a, biko, were onwe-gi mere onye-nwem, bú eze Asiria, ihe-ibe, ka m'nye kwa gi nnù inyinya ise, ọ buru na i puru inyere onwe-gi ndi gānọkwasi ha.
9. Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?
10. Ma ub͕u a ọ̀ bu n'ejighi Jehova ka m'rigoro imegide ala nka ibibi ya? Jehova sirim, Rigo imegide ala nka, bibie ya.
11. Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.