6. Mb͕e ahu ka onye-ngwurọ gāmali dika ele, ire onye-ob͕i gēti kwa nkpu ọṅù: n'ihi na n'ọzara ka miri nāb͕awaputa, miri-iyi kwa n'ala ihe nādighi.
7. Mirage gāghọ kwa ọdọ-miri, ala miri nādighi gāghọ kwa isi-iyi juputara na miri: n'ebe-obibi nkita-ọhia, ebe ha nāmakpu amakpu, ogige nke diri amì na papyrus.
8. Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.
9. Ọ dighi ọdum gādi n'ebe ahu, ọ dighi kwa anu-ọhia nke di irè gārigo n'elu ya, agaghi-ahu ya n'ebe ahu; ma ndi emeworo ka ha nwe onwe-ha nēje ije n'ebe ahu: