9. Ala nēru újú, talata: Lebanon nwere iru-ihere, ọ janwuwo ajanwu: Sheron di ka ala ihe nādighi; Beshan na Kamel nārurupu kwa akwukwọ-ha.
10. Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova nāsi; ub͕u a ka M'gēme onwem ka M'di elu; ub͕u a ka agēbulim.
11. Unu gātu ime ahihia kpọrọ nku, unu gāmu ahihia-ọka: nku-ume-unu bu ọku nke gērichapu unu.
12. Ndi di iche iche gādi kwa ka lime akpọrọ ọku: dika ogwu eb͕uturu eb͕utu, nke anēsure n'ọku.
13. Unu ndi nọ n'ebe di anya, nurunu ihe M'meworo; unu kwa ndi nọ nso, maranu idi-ikem.
14. Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?
15. Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;
16. onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.
17. Eze n'ima-nma-ya ka anya-gi abua gāhu: ha gāhu ala nke ebe nile ọ sọturu di anya.
18. Obi-gi gēchè èchìchè oké ujọ ahu: òle ebe onye nāgu ọnu nọ? òle ebe onye nātù ego-utu nọ? òle ebe onye nāgu ulo-elu ọnu nọ?
19. Ndi ahu nke nwere anya-ike, i gaghi-ahu ya, bú ndi asusu-ya miri emi kari ọnunu; nke ire-ya nāsu nsu nādighi nghọta.
20. Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula.
21. Kama n'ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n'aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n'elu ya.
22. N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.