Aisaia 32:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Agaghi-etechi kwa anya nke ndi nāhu uzọ, nti nke ndi nānu ihe gāṅa kwa nti.

4. Obi nke ndi nēme ngwa ngwa gāghọta kwa ihe-ọmuma, ire nke ndi-nsu gēkwuwa kwa okwu ngwa ngwa.

5. Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.

6. N'ihi na onye-nzuzu gēkwu ihe-nzuzu, obi-ya gēme kwa ajọ ihe, ime ihe emeruru emeru, na ikwu okwu njehie megide Jehova, ime ka nkpuru-obi nke onye agu nāgu b͕ara aka, na ime ka ihe-ọṅuṅu nke onye akpiri nakpọ nku kọ ukọ.

Aisaia 32