Aisaia 32:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Le, n'ezi omume ka otù eze gābu eze, ndi-isi kwa, n'ikpé ziri ezi ka ha gābu ndi-isi.

2. Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu.

3. Agaghi-etechi kwa anya nke ndi nāhu uzọ, nti nke ndi nānu ihe gāṅa kwa nti.

4. Obi nke ndi nēme ngwa ngwa gāghọta kwa ihe-ọmuma, ire nke ndi-nsu gēkwuwa kwa okwu ngwa ngwa.

5. Agaghi-akpọ kwa onye-nzuzu onye amara aha-ya ọzọ, agaghi-asi kwa na onye-aghughọ bu ọgaranya.

Aisaia 32