Aisaia 3:15-23 Bible Nso (IGBOB)

15. gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.

16. Jehova we si, N'ihi na umu-ndinyom Zaion di npako, nēwere kwa olu setiri eseti na anya nāràrá ndikom ejeghari, nārọ nma mb͕e ha nējeghari, nēwere kwa ukwu-ha eme ka ọla-ukwu-ha da udà:

17. n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.

18. N'ubọchi ahu Onye-nwe-ayi gēwezuga ima-nma nke ọla-ukwu-ha nile, na ihe-ichọ-nma nile ha nēyi n'egedege-iru, na ihe-ichọ-nma nile nke yiri ọnwa ọhu;

19. na ihe nile anākwuba na nti, na ọla-aka nile, na ákwà nb͕ochi-iru nile;

20. na ihe ọma nile ike n'isi, na iyab͕a-ukwu nile, na ihe nile ike n'úkwù, na karama ihe ísì ọma nile, na ọgwù di iche iche iyi n'aru;

21. na nb͕a-aka-akàrà nile, na nb͕a-aka imi nile;

22. na uwe ememe nile, na uwe-nwuda nile, na ákwà-nb͕okwasi nile, na akpa nile;

23. na enyo-aka nile, na ezi ákwà ọcha nile, na ákwà ọma nile ikuku n'isi, na ákwà-nb͕ochi nile.

Aisaia 3