Aisaia 28:24-28 Bible Nso (IGBOB)

24. Ọ̀ bu ubọchi nile ka onye-plough nēgwu ala igha nkpuru? ọ̀ bu ubọchi nile ka ọ nēgwughe nēme ka ala-ubi-ya di lari?

25. Ọ buru na o mewo ka iru-ya di lari, ọ̀ dighi-aghasa fitch, gha cummin, kua ọka wheat n'ahiri, gha ọka barley n'ebe akara àkà, gha ọka spelt n'ókè-ala-ya?

26. N'ihi na Chineke-ya nādọ ya aka na nti iluzi aluzi, O nēzí ya ihe.

27. N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.

28. Ànāsupia ọka eji eme achicha? é-è, n'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ ganāzọchasi ya ike, me ka wheel nke ub͕ọ-ala-ya na inyinya-ya nile gagharia n'elu-ya; ọ dighi-asupia ya.

Aisaia 28