4. Ọnuma adighi nimem: ọ gādim nọ̄ nma ma ogwu na uke gēmegidem n'agha! M'gāwaku ha, M'gēsurekọta ha n'otù.
5. Ma-ọbu, ya jide ebem siri ike, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo; e, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo.
6. N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume.
7. Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?
8. N'ọtùtù, mb͕e I nēzilaga ya, ka Gi na ya nēse okwu: O jiwo ifufe-Ya siri ike wepu ya n'ubọchi ifufe Iru-anyanwu.