10. Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n'ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova.
11. Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.
12. Jehova, I gēdoro ayi udo: n'ihi na ọ bu kwa ọlu nile nke ayi ka I luworo ayi.
13. Jehova, Chineke-ayi, ndi nwenu ọzọ enwewo ayi, ọ bughi nání Gi; ma ọ bu nání site na Gi ka ayi gēhota aha-Gi.
14. Ndi nwuru anwu adighi-adi ndu; ndi nādighi ndu adighi-ebili: n'ihi nka ka I letaworo ha we kpochapu ha, me ka ncheta nile nke diri ha la n'iyì.
15. I tukwasiwo madu na mba nka, Jehova, I tukwasiwo madu na mba nka; I natawo nsọpuru: I mewo ka nsọtu nile nke ala di anya.
16. Jehova, n'ahuhu ka ha letaworo Gi, ha takwuru ntakwu n'ekpere nke-uku mb͕e idọ-aka-na-nti-Gi ruru ha aru.
17. Dika nwayi nke di ime, nke gaje imu nwa, si ab͕ali nb͕ali, tie nkpu n'aru-ufu-ya nile; otú a ka ayi diworo n'iru Gi, Jehova.
18. Ayi adiwo ime, ayi ab͕aliwo nb͕ali, ayi amuwo dika agāsi na ọ bu ifufe; ọ bughi ebe nzọputa ka ayi nēme ala; adighi-amuputa kwa ndi ganēbi n'elu-uwa dum madu bi.
19. Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.
20. Bia, ndim, bata n'ime-ulo-gí nile, mechibido uzọ-gi nile n'azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mb͕e oké iwe gāgabiga.
21. N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.