1. N'ubọchi ahu ka agābù abù a n'ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya.
2. Meghenu ọnu-uzọ-ama nile, ka mba nke nēme ezi omume nke nēdebe ikwesi-ntukwasi-obi nile we ba nime.
3. I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.
4. Tukwasinu obi na Jehova rue mb͕e nile ebighi-ebi: n'ihi na Ja Jehova bu oké nkume nke mb͕e nile ebighi-ebi.
5. N'ihi na O budawo ndi bi n'elu, bú obodo di elu: Ọ nēme ka ọ di ala, Ọ nēme ka ọ di ala ọbuná rue ala: Ọ nēme ka ọ darue ájá.
6. Ukwu gāzọda ya; bú ukwu abua nke onye ewedara n'ala, ha na nzọ-ukwu nke ndi nēnweghi ike.
7. Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.
8. Ọzọ, n'uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri.
9. Na nkpuru-obim ka akpiri Gi nātim n'abali; e, mọm nke di nimem ka m'gēji chọsie Gi ike: n'ihi na mb͕e ikpé-Gi nile nādakwasi uwa, ezi omume ka ndi bi n'elu-uwa dum madu bi mutaworo.
10. Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n'ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova.