Aisaia 24:8-18 Bible Nso (IGBOB)

8. Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo.

9. Ha agaghi-eji abù ṅu manya-vine; ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya gādi ndi nāṅu ya ilu.

10. Etipiawo obodo nke ihe tọb͕ọrọ n'efu: emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata.

11. Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ.

12. Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama.

13. N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.

14. Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.

15. N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.

16. Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M'we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u.

17. Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n'uwa.

18. Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu.

Aisaia 24