21. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gēwere nmehie nke usu-ndi-agha nke ebe di elu leta ha n'ebe di elu, Ọ gēwere kwa nmehie nke ndi-eze nke uwa leta ha n'elu uwa.
22. Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n'olùlù, agēmechibido kwa ha n'ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha.
23. Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n'ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n'iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.