Aisaia 24:16-23 Bible Nso (IGBOB)

16. Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M'we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u.

17. Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n'uwa.

18. Ọ gēru kwa, na onye ahu nke nāb͕anari olu oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'etiti olùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na window nile nke di n'elu ka emegheworo, ntọ-ala nile nke uwa ewe me nkpatu.

19. Anyajisiwo uwa, emebisiwo uwa, ewezugasiwo uwa n'ọnọdu-ya.

20. Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n'aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ.

21. Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Jehova gēwere nmehie nke usu-ndi-agha nke ebe di elu leta ha n'ebe di elu, Ọ gēwere kwa nmehie nke ndi-eze nke uwa leta ha n'elu uwa.

22. Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n'olùlù, agēmechibido kwa ha n'ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha.

23. Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n'ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n'iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.

Aisaia 24