1. Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa.
2. O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma.
3. Agāb͕abasi uwa ọtọ, lutasia ya n'agha; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu a.
4. Uwa eruwo újú kpọnwua, elu-uwa dum madu bi atalatawo kpọnwu kwa, ndi di elu nke ndi uwa atalatawo.
5. Emeruwo kwa uwa n'okpuru ndi bi ya; n'ihi na ha agabigawo iwu nile, b͕anwe ukpuru, mebie ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.
6. N'ihi nka ka ọb͕ub͕a-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe: n'ihi nka ka ndi bi n'uwa reworo ọku, madu ole-na-ole we fọdu.
7. Manya-vine ọhu eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndi nile nke nāṅuri ọṅu n'obi ezewo ume.
8. Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo.
9. Ha agaghi-eji abù ṅu manya-vine; ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya gādi ndi nāṅu ya ilu.
10. Etipiawo obodo nke ihe tọb͕ọrọ n'efu: emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata.
11. Iti-nkpu di n'èzí nile n'ihi manya-vine ahu; ọṅù nile ab͕achiwo, emewo ka obi-utọ nke uwa je biri n'ala ọzọ.
12. Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama.
13. N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.
14. Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.
15. N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.