Aisaia 22:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi!

19. M'gākwapu kwa gi n'ebe-nguzo-gi siri ike, o gēsi kwa n'ọnọdu-gi dọda gi.

20. Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gākpọ orùm. bú Elaiakim nwa Hilkaia:

21. M'gēyikwasi ya uwe-gi, were ihe ahu anēke gi n'úkwù kesie ya ike, ọ bu kwa ọchichi-gi ka M'gēnye ya n'aka: ọ gāghọ-kwa-ra ndi bi na Jerusalem na ndi ulo Juda nna.

22. M'gātukwasi kwa nkpisi-ugodi ulo Devid n'ubu-ya; o we meghe, ọ dighi kwa onye nēmechi; o we mechie, ọ dighi kwa onye nēmeghe.

23. M'gākpọgide kwa ya dika ǹtú n'ebe kwesiri ntukwasi-obi; ọ gāghọ-kwa-ra ulo nna-ya oche-eze nsọpuru.

24. Ha gēkokwasi kwa ya nsọpuru nile nke ulo nna-ya, umu-ya na umu-nna-ya, ihe nile nke di ntà, site n'ihe nile bu ọkwa we rue ihe nile bu karama.

Aisaia 22