21. Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n'ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya.
22. Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma.
23. N'ubọchi ahu uzọ atuliri atuli gādi site n'Ijipt we rue Asiria, Asiria ewe ba n'Ijipt, Ijipt gābà kwa n'Asiria: ndi Ijipt gēsoro ndi Asiria fè òfùfè.
24. N'ubọchi ahu ka Israel gēme Ijipt na Asiria atọ, ọ gābu ngọzi n'etiti uwa: