16. N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.
17. Ala Juda gāghọ-kwa-ra Ijipt anya-ajù, onye ọ bula nke anēhotara ya Ijipt gātu oké egwu, n'ihi nzube nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēzube megide ya.
18. N'ubọchi ahu obodo ise gādi n'ala Ijipt ndi nāsu asusu Kenean, ndi nāṅuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha iyi; Obodo nkwada ka agākpọ otù nime ha.
19. N'ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n'etiti ala Ijipt, otù ogidi n'akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova.