Aisaia 19:15-21 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọ dighi kwa ọlu ọ bula Ijipt gēnwe, nke isi ma-ọbu ọdudù, ma-ọbu igu-nkwu ma-ọbu amì, gālu.

16. N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.

17. Ala Juda gāghọ-kwa-ra Ijipt anya-ajù, onye ọ bula nke anēhotara ya Ijipt gātu oké egwu, n'ihi nzube nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēzube megide ya.

18. N'ubọchi ahu obodo ise gādi n'ala Ijipt ndi nāsu asusu Kenean, ndi nāṅuru Jehova nke usu nile nke ndi-agha iyi; Obodo nkwada ka agākpọ otù nime ha.

19. N'ubọchi ahu ebe-ichu-àjà gādiri Jehova n'etiti ala Ijipt, otù ogidi n'akuku ókè-ala-ya gādi-kwa-ra Jehova.

20. Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n'ala Ijipt: n'ihi na ha gētiku Jehova n'ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha.

21. Jehova gēme kwa ka Ijipt mara Ya, ndi Ijipt ewe mara Jehova n'ubọchi ahu; ha gēji kwa àjà na onyinye-inata-iru-ọma fè Ya, ha gēkwe kwa Jehova nkwa, kwughachi kwa ya.

Aisaia 19